Header Ads


PROMOTE YOUR MUSIC >> MUSIC VIDEO >> COMEDY SKIT >> DISTRIBUT YOUR MUSIC TO ALL DIGITAL PLATFORM >> MAKE MONEY ON YOUTUBE >> CALL NOW: 08136514077.......>>>
Home Music Instrumental Videos News Comedy Movies Free Browsing cheats 18+ Videos Free Bet Codes


OTU NZUZO




OTU NZUZO :

Nkowa ihe bu otu nzuzo;

Otu Nzuzo bu abamaba di iche iche enwegasiri n'ala igbo nke onye abughi onye otu ha adighi ama ihe n' eme nime ya.


Njirimara Otu Nzuzo;

a~ ihe niile ana eme na ya adighi aputa ihe.

b~ otu nzuzo n'enwe iwu nke onye obula no na ya ga-edoberiri.

ch~ otutu oru ha na-abukari na nzuzo.

d~ Adighi agba ihe ana eme na ya n'anwụ .

e~ Ana enwe afo ole onye ga-agba tupu obanye n'otu nzuzo ufodu n'ala igbo

f~Nzuko ha otutu oge n'abukari noge abalị ; n'oke ohia maobu mkpuke zoro ezo.


Uru otu nzuzo Bara;

a~Ndi otu nzuzo na-enye aka idozi obodo .

b~ Ha so ahazi ka ndi mmadụ si akpa agwa kwesịrị ekwesi n'obodo .

ch~ Otu nzuzo na~enye onye banyere na ya ugwu na nsopuru.

d~ Otu nzuzo so ahu na-edebere iwu nachi obodo 

e~ Ha so edozi esemeokwu  n'obodo .

f~ Ha na-enyere onye otu ha aka oge ihe daputara ya.

g~ Ana esi na ya amuta ihe di omimi di iche iche .

gb~ Ha na-echekwaba ma kwadokwa onye no na ya .


Oghom di na Ya ;

a~ Iji mmadu achu aja.

b~ icho ka ebumnobi ha buru nke aga eme n'obodo .

ch~ Igaghi eji onu gi kwuo ihe ihuru

d~ Opupu adighi na ya

e~ ihe ana zero ezo,dikwa omimi.

f~ Ha megbuo onye otu ha, ujo agaghi ekwe ya koro onye ozo.

g~  Mmadụ anaghi ama ihe di na ya tupu o banye .

gb~ Esi na ya ezute onwu ike.


Udi otu Nzuzo di iche iche enwegasiri n'ala igbo:

*MMONWU*


Mmonwu bu ndi mmuo na-aputa oge ufodu,ka ha na ndi mmadụ mekorita.


Tupu ndi ocha abia n'ala igbo, mmonwu dika  ndi uwe ojii,maa iwu n'obodo; hukwa na-edebere iwu ndia ya na- ikwusi mmgbasa ihe ojoo.


Emume Iba Mmanwụ .


O bu nwoke tozuru etozu ruo ogogo imata mmanwụ na-abanye mmanwụ .


Aga emere onye ahu emume eji aba mmanwụ .


Oga agba mmanya itike,weta oji n'ego so ya.

Emesia, ndi choro iba n'otu nzuzo mmanwụ ga- abanye n' ulo mmanwụ ,aga ewere omu nkwu gee ya gburugburu, onye abaghi mmanwụ anaghi aba ebe ahu n'ihi n'ogbodi amaghi mmanwụ .

Na ufodu obodo , Ana akpokwa oke dibia nke ga agworo ha ogwu ha ji eze ndu, emekwa anwansi di iche iche .


*OKONKO*


Emume ibanye okonko na-ewe izu uka abuo.


obu umu nwoke tozuru etozu na-aba na ya. Okonko bu otu nzuzo makana obu so onye no n'okonko mara ihe ene eme na ya.


Okonko bu abamaba nke ndi aka ji aku na abanye, obughi maka ndi aka esighi ike.


Emume ibanye Okonko;

Usoro Emume ka esi abanye Okonko di uzo abuo.

a~ IDA MMIRI 

b~ IBA OHIA

 

NKE MBU; ida mmiri 


onye na-aba okonko ohuru ga-akwu ego buru ibu, tupu ubochi ida mmiri eruo.


Oruo ubochi ahu, aga akpụ ya isi okpo; waa ya ogodo tupu akporo ya jebe na mmiri .


Ana eji omunkwu gechie uzo mmiri ebe aga ano taa onye ahu ahuhu di iche iche tupu asaa ya ahu.


Aga amanye onye ahu akwa di mma maoburu na-asachaa ya ahu. Mgbe ana eme nkea odighi onye okpo ga-aga nso ebe ahu makana okpo amaghi okonko.


Emesia ha dum ka ebido ribe oriri na mmanya n'akuku iyi ahu; naku egwu okonko na-gba ya.


IBA OHIA


Ihe ukwu di n'emume okonko na-amalite n'izu nke abuo adasiri mmiri .


Tupu Ubochi ahu, onyeisi ha ga ewere omunkwu tuo gburugburu nnukwu ohia ebe ndi okonko ga-ano mee emume ha.


N'isi ututu ubochi ahu, ndi okonko na ndi ohuru ahu dara mmiri ga-eburu egwu ha kuru gawa n' ohia ahu ebe ha ga-eme ihe ha kporo "iba ohia".


Ha na- ano otutu oge ebe ahu. Ha ga-ano ebe ahu eme akani; oruo n'etiti abali ka ha ji ezi onye ahu dara mmiri ihe nzuzo niile di n'okonko.


Ha ga- eziko ya, otu ha si ekwu okwu, ede uri ala na etu ha si ekele ekele.


Emesia, ha ga asi ya gbara  ha ọchịchịrị akara ala iji gosi n'obu onye otu ha.


Mgbe ha gosichara onye dara mmiri ihe niile ndia. Ha ebido guba egwu.


*AMOSU*


Nkea bu otu nzuzo nke ndi no na ya nagaghari n'  ọchịchịrị .

Ana ewe ndi no na ya dika ajo mmadụ .


Ha neji abali agbako ma narukwa oru ojoo ha.


Ndi amosu nwere ikike igho anu di iche iche , dika; Nwa mba , ikwighikwii,ududo,ochicha,orokombuba,usu,ngwere wdg..


®Nze ThankGod Umeh

(OCHIGWE II)

No comments

Powered by Blogger.